Aịzaya 44:12
Isaiah 44:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.
Isaiah 44:12 in English
Isaiah 44:12 · Berean Standard Bible
The blacksmith takes a tool and labors over the coals; he fashions an idol with hammers and forges it with his strong arms. Yet he grows hungry and loses his strength; he fails to drink water and grows faint.
Context
10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,
nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla? 11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya.
Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ.
Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha,
ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu. 12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya
na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ,
ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị,
ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ.
Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya;
ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba. 13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi
were pensụlụ kaa ya;
ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ,
were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara.
Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ,
oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile,
maka ibi nʼime ụlọ arụsị. 14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche,
maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook.
Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa,
maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.