Native Bible

Isaiah 44:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.

Isaiah 44:11 in English

Isaiah 44:11 · Berean Standard Bible

Behold, all his companions will be put to shame, for the craftsmen themselves are only human. Let them all assemble and take their stand; they will all be brought to terror and shame.

Context

9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa. 10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla? 11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu. 12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba. 13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.