Aịzaya 44:11
Isaiah 44:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.
Isaiah 44:11 in English
Isaiah 44:11 · Berean Standard Bible
Behold, all his companions will be put to shame, for the craftsmen themselves are only human. Let them all assemble and take their stand; they will all be brought to terror and shame.
Context
9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu.
Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi.
Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì,
na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa. 10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,
nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla? 11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya.
Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ.
Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha,
ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu. 12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya
na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ,
ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị,
ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ.
Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya;
ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba. 13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi
were pensụlụ kaa ya;
ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ,
were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara.
Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ,
oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile,
maka ibi nʼime ụlọ arụsị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.