Native Bible

Isaiah 44:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.

Isaiah 44:13 in English

Isaiah 44:13 · Berean Standard Bible

The woodworker extends a measuring line; he marks it out with a stylus; he shapes it with chisels and outlines it with a compass. He fashions it in the likeness of man, like man in all his glory, that it may dwell in a shrine.

Context

11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya. Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ. Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha, ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu. 12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ, ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị, ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ. Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya; ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba. 13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị. 14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche, maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook. Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa, maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma. 15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.