Aịzaya 44:15
Isaiah 44:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere; ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ, ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha. Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya; ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.
Isaiah 44:15 in English
Isaiah 44:15 · Berean Standard Bible
It serves as fuel for man. He takes some of it to warm himself, and he kindles a fire and bakes his bread; he even fashions it into a god and worships it; he makes an idol and bows down to it.
Context
13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi
were pensụlụ kaa ya;
ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ,
were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara.
Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ,
oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile,
maka ibi nʼime ụlọ arụsị. 14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche,
maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook.
Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa,
maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma. 15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere;
ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ,
ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha.
Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya;
ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya. 16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ;
nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya,
ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya.
Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị,
“Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.” 17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;
Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.
Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,
“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.