Aịzaya 44:17
Isaiah 44:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị; Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe. Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị, “Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”
Isaiah 44:17 in English
Isaiah 44:17 · Berean Standard Bible
From the rest he makes a god, his graven image. He bows down to it and worships; he prays to it and says, “Save me, for you are my god.”
Context
15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere;
ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ,
ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha.
Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya;
ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya. 16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ;
nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya,
ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya.
Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị,
“Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.” 17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;
Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.
Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,
“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!” 18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,
nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,
mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta. 19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,
ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,
“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,
Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,
ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.
M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?
Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.