Aịzaya 44:19
Isaiah 44:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”
Isaiah 44:19 in English
Isaiah 44:19 · Berean Standard Bible
And no one considers in his heart, no one has the knowledge or insight to say, “I burned half of it in the fire, and I baked bread on its coals; I roasted meat and I ate. Shall I make something detestable with the rest of it? Shall I bow down to a block of wood?”
Context
17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;
Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.
Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,
“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!” 18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,
nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,
mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta. 19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,
ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,
“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,
Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,
ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.
M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?
Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?” 20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya.
Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị,
“Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?” 21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb,
nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m.
Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m;
gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.