Aịzaya 44:20
Isaiah 44:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya. Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị, “Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”
Isaiah 44:20 in English
Isaiah 44:20 · Berean Standard Bible
He feeds on ashes. His deluded heart has led him astray, and he cannot deliver himself or say, “Is not this thing in my right hand a lie?”
Context
18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,
nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,
mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta. 19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,
ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,
“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,
Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,
ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.
M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?
Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?” 20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya.
Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị,
“Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?” 21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb,
nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m.
Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m;
gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị. 22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,
hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.
Lọghachikwute m,
nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.