Aịzaya 44:21
Isaiah 44:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb, nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m. Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m; gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.
Isaiah 44:21 in English
Isaiah 44:21 · Berean Standard Bible
Remember these things, O Jacob, for you are My servant, O Israel. I have made you, and you are My servant; O Israel, I will never forget you.
Context
19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,
ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,
“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,
Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,
ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.
M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?
Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?” 20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya.
Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị,
“Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?” 21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb,
nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m.
Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m;
gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị. 22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,
hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.
Lọghachikwute m,
nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.” 23Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya;
tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala.
Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile,
unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị,
nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb,
na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.