Aịzaya 44:10
Isaiah 44:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị, nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
Isaiah 44:10 in English
Isaiah 44:10 · Berean Standard Bible
Who fashions a god or casts an idol which profits him nothing?
Context
8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji.
Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga.
Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m?
Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.” 9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu.
Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi.
Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì,
na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa. 10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,
nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla? 11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya.
Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ.
Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha,
ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu. 12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ ya
na-ahụ ya nʼime icheku ọkụ,
ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị,
ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ.
Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya;
ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.