Aịzaya 44:8
Isaiah 44:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”
Isaiah 44:8 in English
Isaiah 44:8 · Berean Standard Bible
Do not tremble or fear. Have I not told you and declared it long ago? You are My witnesses! Is there any God but Me? There is no other Rock; I know not one.”
Context
6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,
onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile:
Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ;
ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m. 7Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya.
Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ!
Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike.
Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro,
ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu. 8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji.
Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga.
Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m?
Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.” 9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu.
Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi.
Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì,
na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa. 10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,
nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.