Aịzaya 43:12
Isaiah 43:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Isaiah 43:12 in English
Isaiah 43:12 · Berean Standard Bible
I alone decreed and saved and proclaimed— I, and not some foreign god among you. So you are My witnesses,” declares the LORD, “that I am God.
Context
10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụrụkwa ndị ohu m họpụtara,
ka unu mara m, ma kwerekwa na m,
ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ.
Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị,
ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu.
Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka.
Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel.
“Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn
budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ,
nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.