Aịzaya 43:10
Isaiah 43:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ.
Isaiah 43:10 in English
Isaiah 43:10 · Berean Standard Bible
“You are My witnesses,” declares the LORD, “and My servant whom I have chosen, so that you may consider and believe Me and understand that I am He. Before Me no god was formed, and after Me none will come.
Context
8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,
ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe. 9Mba niile dị iche iche ezukọtala,
mmadụ niile agbakọtakwala.
Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme,
onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga?
Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi,
ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụrụkwa ndị ohu m họpụtara,
ka unu mara m, ma kwerekwa na m,
ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ.
Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị,
ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu.
Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.