Aịzaya 43:13
Isaiah 43:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?”
Isaiah 43:13 in English
Isaiah 43:13 · Berean Standard Bible
Even from eternity I am He, and none can deliver out of My hand. When I act, who can reverse it?”
Context
11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu.
Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka.
Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel.
“Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn
budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ,
nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi. 15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị,
onye kere Izrel, Eze unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.