Aịzaya 43:15
Isaiah 43:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”
Isaiah 43:15 in English
Isaiah 43:15 · Berean Standard Bible
I am the LORD, your Holy One, the Creator of Israel, and your King.”
Context
13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka.
Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel.
“Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn
budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ,
nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi. 15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị,
onye kere Izrel, Eze unu.” 16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri,
nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri. 17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ,
mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ,
dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.