Native Bible

Isaiah 43:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri, nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.

Isaiah 43:16 in English

Isaiah 43:16 · Berean Standard Bible

Thus says the LORD, who makes a way in the sea and a path through the surging waters,

Context

14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi. 15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.” 16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri, nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri. 17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta, ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ, mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ, dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ. 18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.