Aịzaya 41:28
Isaiah 41:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
Isaiah 41:28 in English
Isaiah 41:28 · Berean Standard Bible
When I look, there is no one; there is no counselor among them; when I ask them, they have nothing to say.
Context
26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,
maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’?
O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a,
o nweghịkwa onye mere ka amata ya,
o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. 27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’
Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma. 28Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ.
O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ;
o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha. 29Lee, ha niile bụ ụgha!
Ọrụ ha niile pụtara ihe efu,
arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.