Native Bible

Isaiah 41:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.

Isaiah 41:27 in English

Isaiah 41:27 · Berean Standard Bible

I was the first to tell Zion:* ‘Look, here they are!’ And I gave to Jerusalem a herald of good news.

Context

25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ. 26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. 27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma. 28Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha. 29Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.