Aịzaya 41:25
Isaiah 41:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
Isaiah 41:25 in English
Isaiah 41:25 · Berean Standard Bible
I have raised up one from the north, and he has come— one from the east who calls on My name. He will march over rulers as if they were mortar, like a potter who treads the clay.
Context
23gwa anyị ihe ọdịnihu ji,
ka anyị mara na unu bụ chi.
Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ,
nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu. 24Ma unu dị nta karịa ihe efu.
Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru.
Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ. 25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.
Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ.
Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ,
ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ. 26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,
maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’?
O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a,
o nweghịkwa onye mere ka amata ya,
o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. 27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’
Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.