Aịzaya 41:23
Isaiah 41:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
Isaiah 41:23 in English
Isaiah 41:23 · Berean Standard Bible
Tell us the things that are to come, so that we may know that you are gods. Yes, do something good or evil, that we may look on together in dismay.
Context
21“Wepụtanụ mkpesa unu,”
ka Onyenwe anyị sịrị,
“Doo okwu unu nʼusoro,”
ka Eze nke Jekọb na-asịkwa. 22“Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị,
ihe gaje ime.
Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara,
ka anyị nwee ike tulee ha
matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha.
Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa, 23gwa anyị ihe ọdịnihu ji,
ka anyị mara na unu bụ chi.
Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ,
nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu. 24Ma unu dị nta karịa ihe efu.
Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru.
Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ. 25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.
Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ.
Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ,
ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.