Native Bible

Isaiah 41:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.

Isaiah 41:21 in English

Isaiah 41:21 · Berean Standard Bible

“Present your case,” says the LORD. “Submit your arguments,” says the King of Jacob.

Context

19Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, 20ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya. 21“Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa. 22“Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa, 23gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.