Aịzaya 41:26
Isaiah 41:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
Isaiah 41:26 in English
Isaiah 41:26 · Berean Standard Bible
Who has declared this from the beginning, so that we may know, and from times past, so that we may say: ‘He was right’? No one announced it, no one foretold it, no one heard your words.
Context
24Ma unu dị nta karịa ihe efu.
Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru.
Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ. 25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.
Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ.
Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ,
ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ. 26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,
maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’?
O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a,
o nweghịkwa onye mere ka amata ya,
o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. 27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’
Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma. 28Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ.
O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ;
o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.