Aịzaya 41:17
Isaiah 41:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
Isaiah 41:17 in English
Isaiah 41:17 · Berean Standard Bible
The poor and needy seek water, but there is none; their tongues are parched with thirst. I, the LORD, will answer them; I, the God of Israel, will not forsake them.
Context
15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka
nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze.
Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha,
meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka. 16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,
oke ikuku ga-ekposasị ha.
Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. 17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,
mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ
mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri,
mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha.
Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. 18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.
Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile.
Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta. 19Aga m akụ nʼọzara,
osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv.
M ga-eji osisi junipa,
na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.