Aịzaya 41:16
Isaiah 41:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
Isaiah 41:16 in English
Isaiah 41:16 · Berean Standard Bible
You will winnow them, and a wind will carry them away; a gale will scatter them. But you will rejoice in the LORD; you will glory in the Holy One of Israel.
Context
14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,
unu Izrel dị nta, atụla egwu,
nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel. 15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka
nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze.
Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha,
meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka. 16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,
oke ikuku ga-ekposasị ha.
Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. 17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,
mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ
mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri,
mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha.
Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. 18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.
Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile.
Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.