Aịzaya 41:18
Isaiah 41:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
Isaiah 41:18 in English
Isaiah 41:18 · Berean Standard Bible
I will open rivers on the barren heights, and fountains in the middle of the valleys. I will turn the desert into a pool of water, and the dry land into flowing springs.
Context
16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,
oke ikuku ga-ekposasị ha.
Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. 17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,
mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ
mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri,
mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha.
Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. 18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.
Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile.
Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta. 19Aga m akụ nʼọzara,
osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv.
M ga-eji osisi junipa,
na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, 20ka ndị mmadụ hụ, matakwa,
tuleekwa uche ma ghọta,
na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a,
na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.