Aịzaya 37:25
Isaiah 37:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’
Isaiah 37:25 in English
Isaiah 37:25 · Berean Standard Bible
I have dug wells and drunk foreign * waters. With the soles of my feet I have dried up all the streams of Egypt.”
Context
23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?
Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị
welie olu okwu gị na anya gị elu megide?
Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel? 24I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,
ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.
Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee
ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’ 26“Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya,
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume. 27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,
na ome na-epupụta epupụta,
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.