Aịzaya 37:26
Isaiah 37:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya, ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
Isaiah 37:26 in English
Isaiah 37:26 · Berean Standard Bible
Have you not heard? Long ago I ordained it; in days of old I planned it. Now I have brought it to pass, that you should crush fortified cities into piles of rubble.
Context
24I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,
ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.
Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee
ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’ 26“Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya,
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume. 27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,
na ome na-epupụta epupụta,
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,
marakwa oke iwe gị megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.