Aịzaya 37:28
Isaiah 37:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ, marakwa ọpụpụ gị na mbata gị, marakwa oke iwe gị megide m.
Isaiah 37:28 in English
Isaiah 37:28 · Berean Standard Bible
But I know your sitting down, your going out and coming in, and your raging against Me.
Context
26“Ọ bụ na ị nụbeghị?
Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.
Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya,
ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,
na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,
ghọọ mkpokọta nkume. 27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,
na ome na-epupụta epupụta,
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,
marakwa oke iwe gị megide m. 29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko* m nʼimi gị,
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị,
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa. 30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya.
“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.