Aịzaya 37:29
Isaiah 37:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko* m nʼimi gị, werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị, mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.
Isaiah 37:29 in English
Isaiah 37:29 · Berean Standard Bible
Because your rage and arrogance against Me have reached My ears, I will put My hook in your nose and My bit in your mouth; I will send you back the way you came.’
Context
27Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,
bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.
Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,
na ome na-epupụta epupụta,
nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ
nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,
marakwa oke iwe gị megide m. 29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko* m nʼimi gị,
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị,
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa. 30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya.
“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.