Aịzaya 37:30
Isaiah 37:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
Isaiah 37:30 in English
Isaiah 37:30 · Berean Standard Bible
And this will be a sign to you, O Hezekiah: This year you will eat what grows on its own, and in the second year what springs from the same. But in the third year you will sow and reap; you will plant vineyards and eat their fruit.
Context
28“Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,
marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,
marakwa oke iwe gị megide m. 29Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,
nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,
aga m etinye nko* m nʼimi gị,
werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị,
mee ka ị laghachi
site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa. 30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya.
“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 32Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta,
otu ndị fọdụrụ ndụ* ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezu nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.