Native Bible

Isaiah 37:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ* ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a.

Isaiah 37:32 in English

Isaiah 37:32 · Berean Standard Bible

For a remnant will go forth from Jerusalem, and survivors from Mount Zion. The zeal of the LORD of Hosts will accomplish this.

Context

30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya. “Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi, kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 32Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ* ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a. 33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa. “Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.