Aịzaya 37:32
Isaiah 37:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta, otu ndị fọdụrụ ndụ* ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezu nke a.
Isaiah 37:32 in English
Isaiah 37:32 · Berean Standard Bible
For a remnant will go forth from Jerusalem, and survivors from Mount Zion. The zeal of the LORD of Hosts will accomplish this.
Context
30“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama* nye gị, Hezekaya.
“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,
nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.
Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,
kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 31Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda
ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 32Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta,
otu ndị fọdụrụ ndụ* ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.
Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-emezu nke a. 33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa.
“Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a
maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.
Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,
maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;
ọ gaghị abanye nʼobodo a.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.