Native Bible

Isaiah 37:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.

Isaiah 37:24 in English

Isaiah 37:24 · Berean Standard Bible

Through your servants you have taunted the Lord, and you have said: “With my many chariots I have ascended to the heights of the mountains, to the remote peaks of Lebanon. I have cut down its tallest cedars, the finest of its cypresses.* I have reached its farthest heights, the densest of its forests.

Context

22nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya. “Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn, na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị, Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ. 23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel? 24I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’ 26“Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya, ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.