Aịzaya 37:23
Isaiah 37:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel?
Isaiah 37:23 in English
Isaiah 37:23 · Berean Standard Bible
Whom have you taunted and blasphemed? Against whom have you raised your voice and lifted your eyes in pride? Against the Holy One of Israel!
Context
21Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa, 22nke a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru megide ya.
“Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn,
na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị,
Nwaada Jerusalem
na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ. 23Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?
Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị
welie olu okwu gị na anya gị elu megide?
Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel? 24I sitere nʼaka ndị ozi gị
kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,
ị sịkwara,
‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m
rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,
nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.
Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,
na osisi junipa ya niile kachasị mma.
Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu,
bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 25Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,
ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.
Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee
ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.