Native Bible

Isaiah 35:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya.

Isaiah 35:8 in English

Isaiah 35:8 · Berean Standard Bible

And there will be a highway called the Way of Holiness. The unclean will not travel it— only those who walk in the Way— and fools will not stray onto it.

Context

6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude* ga-efelaga. 35:2 Maọbụ, ịma mma 35:8 Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ 35:10 Ya bụ, ize ume

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.