Aịzaya 35:8
Isaiah 35:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya.
Isaiah 35:8 in English
Isaiah 35:8 · Berean Standard Bible
And there will be a highway called the Way of Holiness. The unclean will not travel it— only those who walk in the Way— and fools will not stray onto it.
Context
6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.
Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,
mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.
Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.
Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;
ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,
Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.
Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,
ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.
Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.
E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.
Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha.
Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha.
Iru ụjụ na ịsụ ude* ga-efelaga.
35:2 Maọbụ, ịma mma
35:8 Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ
35:10 Ya bụ, ize ume
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.