Aịzaya 35:6
Isaiah 35:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.
Isaiah 35:6 in English
Isaiah 35:6 · Berean Standard Bible
Then the lame will leap like a deer and the mute tongue will shout for joy. For waters will gush forth in the wilderness, and streams in the desert.
Context
4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,
“Dịrịnụ ike, unu atụla egwu,
nʼihi na Chineke unu na-abịa.
Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ,
ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha.
Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.
Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,
mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.
Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.
Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;
ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,
Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.
Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,
ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.