Aịzaya 35:7
Isaiah 35:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya.
Isaiah 35:7 in English
Isaiah 35:7 · Berean Standard Bible
The parched ground will become a pool, the thirsty land springs of water. In the haunt where jackals * once lay, there will be grass and reeds and papyrus.
Context
5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.
Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,
mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.
Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.
Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;
ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,
Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.
Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,
ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.
Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.
E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.
Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.