Aịzaya 35
Isaiah 35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ;
okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara.
Dịka rozu, 2ọ ga-agbawa ifuru jupụta;
ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.
A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn,
nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel.
Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ,
ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu* nke Chineke anyị. 3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike,
gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume. 4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,
“Dịrịnụ ike, unu atụla egwu,
nʼihi na Chineke unu na-abịa.
Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ,
ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha.
Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.
Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,
mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. 7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.
Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.
Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;
ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. 8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,
Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.
Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,
ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.
Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.
E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.
Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha.
Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha.
Iru ụjụ na ịsụ ude* ga-efelaga.
35:2 Maọbụ, ịma mma
35:8 Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ
35:10 Ya bụ, ize ume
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.