Aịzaya 35:10
Isaiah 35:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude* ga-efelaga. 35:2 Maọbụ, ịma mma 35:8 Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ 35:10 Ya bụ, ize ume
Isaiah 35:10 in English
Isaiah 35:10 · Berean Standard Bible
So the redeemed of the LORD will return and enter Zion with singing, crowned with everlasting joy. Gladness and joy will overtake them, and sorrow and sighing will flee.
Context
8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,
Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.
Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,
ndị nzuzu ajọ omume* agaghị ejegharị nʼelu ya. 9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.
Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.
E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.
Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. 10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.
Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;
ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha.
Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha.
Iru ụjụ na ịsụ ude* ga-efelaga.
35:2 Maọbụ, ịma mma
35:8 Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ
35:10 Ya bụ, ize ume
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.