Aịzaya 35:4
Isaiah 35:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.”
Isaiah 35:4 in English
Isaiah 35:4 · Berean Standard Bible
Say to those with anxious hearts: “Be strong, do not fear! Behold, your God will come with vengeance. With divine retribution He will come to save you.”
Context
2ọ ga-agbawa ifuru jupụta;
ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.
A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn,
nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel.
Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ,
ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu* nke Chineke anyị. 3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike,
gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume. 4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,
“Dịrịnụ ike, unu atụla egwu,
nʼihi na Chineke unu na-abịa.
Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ,
ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha.
Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.” 5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe. 6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.
Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,
mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.