Aịzaya 31:6
Isaiah 31:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide.
Isaiah 31:6 in English
Isaiah 31:6 · Berean Standard Bible
Return to the One against whom you have so blatantly rebelled, O children of Israel.
Context
4Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,
“Dịka ọdụm na-agbọ ụja,
na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,
nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ
imegide ya,
ọ naghị atụ egwu mkpu ha,
mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,
Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata
ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile. 5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,
otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,
ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,
ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.” 6Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. 7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ. 8“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,
mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.
Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,
ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.