Aịzaya 31:7
Isaiah 31:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.
Isaiah 31:7 in English
Isaiah 31:7 · Berean Standard Bible
For on that day, every one of you will reject the idols of silver and gold that your own hands have sinfully made.
Context
5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,
otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,
ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,
ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.” 6Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. 7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ. 8“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,
mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.
Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,
ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye. 9Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu,
ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Onye ọkụ ya dị na Zayọn,
onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.