Aịzaya 31:9
Isaiah 31:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.
Isaiah 31:9 in English
Isaiah 31:9 · Berean Standard Bible
Their rock will pass away for fear, and their princes will panic at the sight of the battle standard,” declares the LORD, whose fire is in Zion, whose furnace is in Jerusalem.
Context
7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ. 8“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,
mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.
Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,
ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye. 9Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu,
ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Onye ọkụ ya dị na Zayọn,
onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.