Aịzaya 31:5
Isaiah 31:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya, otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem, ọ ga-ekpuchi ya napụta ya, ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”
Isaiah 31:5 in English
Isaiah 31:5 · Berean Standard Bible
Like birds hovering overhead, so the LORD of Hosts will protect Jerusalem. He will shield it and deliver it; He will pass over it and preserve it.”
Context
3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke!
Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ.
Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha,
ha ga-asọ ngọngọ;
ndị ha na-enyere aka ga-adakwa.
Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi. 4Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,
“Dịka ọdụm na-agbọ ụja,
na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,
nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ
imegide ya,
ọ naghị atụ egwu mkpu ha,
mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,
Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata
ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile. 5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,
otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,
ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,
ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.” 6Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. 7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.