Aịzaya 31:3
Isaiah 31:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.
Isaiah 31:3 in English
Isaiah 31:3 · Berean Standard Bible
But the Egyptians are men, not God; their horses are flesh, not spirit. When the LORD stretches out His hand, the helper will stumble, and the one he helps will fall; both will perish together.
Context
1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,
ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,
ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,
ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.
Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;
ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka. 2Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.
Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.
Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;
ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka. 3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke!
Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ.
Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha,
ha ga-asọ ngọngọ;
ndị ha na-enyere aka ga-adakwa.
Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi. 4Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,
“Dịka ọdụm na-agbọ ụja,
na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,
nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ
imegide ya,
ọ naghị atụ egwu mkpu ha,
mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,
Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata
ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile. 5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,
otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,
ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,
ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.