Native Bible

Isaiah 31:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.

Isaiah 31:1 in English

Isaiah 31:1 · Berean Standard Bible

Woe to those who go down to Egypt for help, who rely on horses, who trust in their abundance of chariots and in their multitude of horsemen. They do not look to the Holy One of Israel; they do not seek the LORD.

Context

1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka. 2Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka. 3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.