Aịzaya 3:24
Isaiah 3:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
Isaiah 3:24 in English
Isaiah 3:24 · Berean Standard Bible
Instead of fragrance there will be a stench; instead of a belt, a rope; instead of styled hair, baldness; instead of fine clothing, sackcloth; instead of beauty, shame.*
Context
22ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile, 23ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile. 24Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure;
nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri;
nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi;
nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi;
nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị. 25Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo,
ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha. 26Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ.
Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
3:8 2Ih 36:17
3:10 Abụ 128:2
3:14 Nʼihi na ọ bụ ha na-emegbu ndị ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.