Aịzaya 3:22
Isaiah 3:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
Isaiah 3:22 in English
Isaiah 3:22 · Berean Standard Bible
their festive robes, capes, cloaks, and purses;
Context
20ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche; 21ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile, 22ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile, 23ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile. 24Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure;
nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri;
nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi;
nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi;
nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.