Native Bible

Isaiah 29:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.

Isaiah 29:22 in English

Isaiah 29:22 · Berean Standard Bible

Therefore the LORD who redeemed Abraham says of the house of Jacob: “No longer will Jacob be ashamed and no more will his face grow pale.

Context

20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji. 24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.” 29:1 Nke a bụ aha ọzọ e ji mara Jerusalem. 29:5 Ya bụ, ndị ala ọzọ na-emegide gị 29:16 Ka unu si bụrụ ndị nzuzu

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.