Aịzaya 29:22
Isaiah 29:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.
Isaiah 29:22 in English
Isaiah 29:22 · Berean Standard Bible
Therefore the LORD who redeemed Abraham says of the house of Jacob: “No longer will Jacob be ashamed and no more will his face grow pale.
Context
20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;
ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,
ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,
ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,
ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,
“Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.
Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha,
bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha,
ha ga-edo aha m nsọ,
ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb,
ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji. 24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta,
ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”
29:1 Nke a bụ aha ọzọ e ji mara Jerusalem.
29:5 Ya bụ, ndị ala ọzọ na-emegide gị
29:16 Ka unu si bụrụ ndị nzuzu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.