Native Bible

Isaiah 29:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.

Isaiah 29:21 in English

Isaiah 29:21 · Berean Standard Bible

those who indict a man with a word, who ensnare the mediator at the gate, and who with false charges deprive the innocent of justice.

Context

19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa; ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa, ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka. 22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb, “Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ. Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ. 23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha, bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb, ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.