Aịzaya 29:19
Isaiah 29:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
Isaiah 29:19 in English
Isaiah 29:19 · Berean Standard Bible
The humble will increase their joy in the LORD, and the poor among men will rejoice in the Holy One of Israel.
Context
17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,
ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,
ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,
hụkwa ụzọ ọzọ. 19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ
nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye. 20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;
ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,
ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha, 21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,
ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,
ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.