Aịzaya 29:17
Isaiah 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe, ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?
Isaiah 29:17 in English
Isaiah 29:17 · Berean Standard Bible
In a very short time, will not Lebanon become an orchard, and the orchard seem like a forest?
Context
15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche
na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,
ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,
“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!” 16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,*
ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.
Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,
“Ị kpụghị m”?
Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,
“Ị ghọtaghị ihe ọbụla”? 17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,
ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa? 18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,
ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,
hụkwa ụzọ ọzọ. 19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọ
nke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.